Ụbọchị Ịrị ná Ịse nke Ọnwa January

Ụbọchị Ịrị ná Ịse nke Ọnwa January

ọ bú taa,
na ụbọchị nkè iri ná ịse na afọ 1970
kà ndí agha Biafra mighachiri mma n’obo…

mkpebi ha na-ebi ndụ ịkwa ụta

ọbọdọ Naijiria jị aka nri nabata anyị
jírí áká ekpe te anyị okpo na ísì

ha jị ọnụ ọchị mako anyị
jírí áká ọdụ sugbuo anyị ka akpu

há buru ya dị ka abụ, ‘udo udo’
mànà omume ha bú ‘gbuo ha dum’

há gwara anyị na anyị bú otú
ma jírí nkam ányá nara anyị ala na Legosu,
nara anyị ụlọ na Ìgwèọcha, Asàbà, Benue,
nara anyị égo, hapụrụ anyị nair...

 •  0 comments  •  flag
Share on Twitter
Published on January 15, 2024 02:39
No comments have been added yet.